Native Bible

Ezekiel 32:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe m ga-emenyụ gị dịka ọkụ, aga m ekpuchi ihu eluigwe, meekwa ka kpakpando niile jie nji. Aga m eji igwe ojii mechie ihu anyanwụ, ọnwa agakwaghị enye ìhè ya.

Ezekiel 32:7 in English

Ezekiel 32:7 · Berean Standard Bible

When I extinguish you, I will cover the heavens and darken their stars. I will cover the sun with a cloud, and the moon will not give its light.

Context

5Aga m tụsasịkwa anụ ahụ gị nʼugwu niile, werekwa ihe ọbụla fọdụrụ nʼime gị mejuo ndagwurugwu niile. 6M ga-eji ọbara gị na-asọ asọ dee ala niile dịka mmiri ọ bụladị ruo nʼugwu niile, ebe niile mmiri si erufe ga-ejupụtakwa nʼanụ ahụ gị. 7Mgbe m ga-emenyụ gị dịka ọkụ, aga m ekpuchi ihu eluigwe, meekwa ka kpakpando niile jie nji. Aga m eji igwe ojii mechie ihu anyanwụ, ọnwa agakwaghị enye ìhè ya. 8Ihe niile nke na-enye ìhè nʼeluigwe ka m ga-eme ka ha jie nji nʼelu gị, mee ka ọchịchịrị gbachie nʼala gị niile, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya. 9Aga m eweta obi mgbawa nʼetiti ndị mmadụ dị iche iche mgbe m ga-eme ka mbibi gị bịa nʼetiti mba niile nʼime ala dị iche iche nke ị na-amaghị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.