Native Bible

Ezekiel 32:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Aga m eweta obi mgbawa nʼetiti ndị mmadụ dị iche iche mgbe m ga-eme ka mbibi gị bịa nʼetiti mba niile nʼime ala dị iche iche nke ị na-amaghị.

Ezekiel 32:9 in English

Ezekiel 32:9 · Berean Standard Bible

‘I will trouble the hearts of many peoples, when I bring about your destruction among the nations, in countries * you do not know.

Context

7Mgbe m ga-emenyụ gị dịka ọkụ, aga m ekpuchi ihu eluigwe, meekwa ka kpakpando niile jie nji. Aga m eji igwe ojii mechie ihu anyanwụ, ọnwa agakwaghị enye ìhè ya. 8Ihe niile nke na-enye ìhè nʼeluigwe ka m ga-eme ka ha jie nji nʼelu gị, mee ka ọchịchịrị gbachie nʼala gị niile, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya. 9Aga m eweta obi mgbawa nʼetiti ndị mmadụ dị iche iche mgbe m ga-eme ka mbibi gị bịa nʼetiti mba niile nʼime ala dị iche iche nke ị na-amaghị. 10Aga m eme ka i ju ọtụtụ ndị mmadụ anya,* ndị eze ha ga-ama jijiji nʼụjọ maka gị mgbe m ga-efegharị mma agha m nʼihu ha. Onye ọbụla nʼime ha ga-ama jijiji* na ntabi anya ọbụla nʼihi ndụ ya nʼụbọchị ahụ, ị ga-ada. 11“ ‘Nʼihi na nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “ ‘Mma agha nke eze Babilọn ga-abịakwasị gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.