Izikiel 32:9
Ezekiel 32:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m eweta obi mgbawa nʼetiti ndị mmadụ dị iche iche mgbe m ga-eme ka mbibi gị bịa nʼetiti mba niile nʼime ala dị iche iche nke ị na-amaghị.
Ezekiel 32:9 in English
Ezekiel 32:9 · Berean Standard Bible
‘I will trouble the hearts of many peoples, when I bring about your destruction among the nations, in countries * you do not know.
Context
7Mgbe m ga-emenyụ gị dịka ọkụ, aga m ekpuchi ihu eluigwe,
meekwa ka kpakpando niile jie nji.
Aga m eji igwe ojii mechie ihu anyanwụ,
ọnwa agakwaghị enye ìhè ya. 8Ihe niile nke na-enye ìhè nʼeluigwe
ka m ga-eme ka ha jie nji nʼelu gị,
mee ka ọchịchịrị gbachie nʼala gị niile, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya. 9Aga m eweta obi mgbawa nʼetiti ndị mmadụ dị iche iche
mgbe m ga-eme ka mbibi gị bịa nʼetiti mba niile
nʼime ala dị iche iche nke ị na-amaghị. 10Aga m eme ka i ju ọtụtụ ndị mmadụ anya,*
ndị eze ha ga-ama jijiji nʼụjọ maka gị
mgbe m ga-efegharị mma agha m nʼihu ha.
Onye ọbụla nʼime ha ga-ama jijiji*
na ntabi anya ọbụla nʼihi ndụ ya
nʼụbọchị ahụ, ị ga-ada. 11“ ‘Nʼihi na nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,
“ ‘Mma agha nke eze Babilọn
ga-abịakwasị gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.