Native Bible

Ezekiel 32:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Aga m eme ka i ju ọtụtụ ndị mmadụ anya,* ndị eze ha ga-ama jijiji nʼụjọ maka gị mgbe m ga-efegharị mma agha m nʼihu ha. Onye ọbụla nʼime ha ga-ama jijiji* na ntabi anya ọbụla nʼihi ndụ ya nʼụbọchị ahụ, ị ga-ada.

Ezekiel 32:10 in English

Ezekiel 32:10 · Berean Standard Bible

I will cause many peoples to be appalled over you, and their kings will shudder in horror because of you when I brandish My sword before them. On the day of your downfall each of them will tremble every moment for his life.’

Context

8Ihe niile nke na-enye ìhè nʼeluigwe ka m ga-eme ka ha jie nji nʼelu gị, mee ka ọchịchịrị gbachie nʼala gị niile, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya. 9Aga m eweta obi mgbawa nʼetiti ndị mmadụ dị iche iche mgbe m ga-eme ka mbibi gị bịa nʼetiti mba niile nʼime ala dị iche iche nke ị na-amaghị. 10Aga m eme ka i ju ọtụtụ ndị mmadụ anya,* ndị eze ha ga-ama jijiji nʼụjọ maka gị mgbe m ga-efegharị mma agha m nʼihu ha. Onye ọbụla nʼime ha ga-ama jijiji* na ntabi anya ọbụla nʼihi ndụ ya nʼụbọchị ahụ, ị ga-ada. 11“ ‘Nʼihi na nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “ ‘Mma agha nke eze Babilọn ga-abịakwasị gị. 12Usuu ndị agha gị ga-adakwa nʼihu mma agha nke ndị dị ike, bụ ndị mba ahụ kachasị mba niile njọ. Nganga niile nke Ijipt na ndị ya, ka ha ga-egwepịa. Ha ga-akwatu usuu ndị agha ha niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.