Izikiel 32:12
Ezekiel 32:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Usuu ndị agha gị ga-adakwa nʼihu mma agha nke ndị dị ike, bụ ndị mba ahụ kachasị mba niile njọ. Nganga niile nke Ijipt na ndị ya, ka ha ga-egwepịa. Ha ga-akwatu usuu ndị agha ha niile.
Ezekiel 32:12 in English
Ezekiel 32:12 · Berean Standard Bible
I will make your hordes fall by the swords of the mighty, the most ruthless of all nations. They will ravage the pride of Egypt and all her multitudes will be destroyed.
Context
10Aga m eme ka i ju ọtụtụ ndị mmadụ anya,*
ndị eze ha ga-ama jijiji nʼụjọ maka gị
mgbe m ga-efegharị mma agha m nʼihu ha.
Onye ọbụla nʼime ha ga-ama jijiji*
na ntabi anya ọbụla nʼihi ndụ ya
nʼụbọchị ahụ, ị ga-ada. 11“ ‘Nʼihi na nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,
“ ‘Mma agha nke eze Babilọn
ga-abịakwasị gị. 12Usuu ndị agha gị ga-adakwa nʼihu mma agha
nke ndị dị ike,
bụ ndị mba ahụ kachasị mba niile njọ.
Nganga niile nke Ijipt na ndị ya, ka ha ga-egwepịa.
Ha ga-akwatu usuu ndị agha ha niile. 13Aga m emekwa ka anụmanụ ya niile,
nke na-ata ahịhịa nʼakụkụ mmiri laa nʼiyi.
Ụkwụ mmadụ, na ụkwụ anụmanụ
agakwaghị agbarụ mmiri ahụ ọzọ. 14Nʼihi ya, mmiri niile nke ya ga-adị ọcha,
na-asọkwa dịka mmanụ.
Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.