Izikiel 32:14
Ezekiel 32:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi ya, mmiri niile nke ya ga-adị ọcha, na-asọkwa dịka mmanụ. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru.
Ezekiel 32:14 in English
Ezekiel 32:14 · Berean Standard Bible
Then I will let her waters settle and will make her rivers flow like oil,’ declares the Lord GOD.
Context
12Usuu ndị agha gị ga-adakwa nʼihu mma agha
nke ndị dị ike,
bụ ndị mba ahụ kachasị mba niile njọ.
Nganga niile nke Ijipt na ndị ya, ka ha ga-egwepịa.
Ha ga-akwatu usuu ndị agha ha niile. 13Aga m emekwa ka anụmanụ ya niile,
nke na-ata ahịhịa nʼakụkụ mmiri laa nʼiyi.
Ụkwụ mmadụ, na ụkwụ anụmanụ
agakwaghị agbarụ mmiri ahụ ọzọ. 14Nʼihi ya, mmiri niile nke ya ga-adị ọcha,
na-asọkwa dịka mmanụ.
Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru. 15Mgbe m bibiri Ijipt,
kpochapụkwa ihe niile dị nʼime ya,
mgbe m tidara ndị niile bi nʼime ya,
ha ga-amata nʼezie na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ 16“Nke a bụ abụ akwa ha ga-abụrụ ya. Ndị inyom mba dị iche iche ga-abụ ya. Ha ga-abụ ya nʼihi Ijipt na usuu ndị agha ya, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.