Native Bible

Ezekiel 32:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi ya, mmiri niile nke ya ga-adị ọcha, na-asọkwa dịka mmanụ. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru.

Ezekiel 32:14 in English

Ezekiel 32:14 · Berean Standard Bible

Then I will let her waters settle and will make her rivers flow like oil,’ declares the Lord GOD.

Context

12Usuu ndị agha gị ga-adakwa nʼihu mma agha nke ndị dị ike, bụ ndị mba ahụ kachasị mba niile njọ. Nganga niile nke Ijipt na ndị ya, ka ha ga-egwepịa. Ha ga-akwatu usuu ndị agha ha niile. 13Aga m emekwa ka anụmanụ ya niile, nke na-ata ahịhịa nʼakụkụ mmiri laa nʼiyi. Ụkwụ mmadụ, na ụkwụ anụmanụ agakwaghị agbarụ mmiri ahụ ọzọ. 14Nʼihi ya, mmiri niile nke ya ga-adị ọcha, na-asọkwa dịka mmanụ. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru. 15Mgbe m bibiri Ijipt, kpochapụkwa ihe niile dị nʼime ya, mgbe m tidara ndị niile bi nʼime ya, ha ga-amata nʼezie na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ 16“Nke a bụ abụ akwa ha ga-abụrụ ya. Ndị inyom mba dị iche iche ga-abụ ya. Ha ga-abụ ya nʼihi Ijipt na usuu ndị agha ya, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.