Izikiel 32:13
Ezekiel 32:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m emekwa ka anụmanụ ya niile, nke na-ata ahịhịa nʼakụkụ mmiri laa nʼiyi. Ụkwụ mmadụ, na ụkwụ anụmanụ agakwaghị agbarụ mmiri ahụ ọzọ.
Ezekiel 32:13 in English
Ezekiel 32:13 · Berean Standard Bible
I will slaughter all her cattle beside the abundant waters. No human foot will muddy them again, and no cattle hooves will disturb them.
Context
11“ ‘Nʼihi na nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,
“ ‘Mma agha nke eze Babilọn
ga-abịakwasị gị. 12Usuu ndị agha gị ga-adakwa nʼihu mma agha
nke ndị dị ike,
bụ ndị mba ahụ kachasị mba niile njọ.
Nganga niile nke Ijipt na ndị ya, ka ha ga-egwepịa.
Ha ga-akwatu usuu ndị agha ha niile. 13Aga m emekwa ka anụmanụ ya niile,
nke na-ata ahịhịa nʼakụkụ mmiri laa nʼiyi.
Ụkwụ mmadụ, na ụkwụ anụmanụ
agakwaghị agbarụ mmiri ahụ ọzọ. 14Nʼihi ya, mmiri niile nke ya ga-adị ọcha,
na-asọkwa dịka mmanụ.
Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru. 15Mgbe m bibiri Ijipt,
kpochapụkwa ihe niile dị nʼime ya,
mgbe m tidara ndị niile bi nʼime ya,
ha ga-amata nʼezie na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.