Izikiel 32:15
Ezekiel 32:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe m bibiri Ijipt, kpochapụkwa ihe niile dị nʼime ya, mgbe m tidara ndị niile bi nʼime ya, ha ga-amata nʼezie na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’
Ezekiel 32:15 in English
Ezekiel 32:15 · Berean Standard Bible
‘When I make the land of Egypt a desolation and empty it of all that filled it, when I strike down all who live there, then they will know that I am the LORD.’
Context
13Aga m emekwa ka anụmanụ ya niile,
nke na-ata ahịhịa nʼakụkụ mmiri laa nʼiyi.
Ụkwụ mmadụ, na ụkwụ anụmanụ
agakwaghị agbarụ mmiri ahụ ọzọ. 14Nʼihi ya, mmiri niile nke ya ga-adị ọcha,
na-asọkwa dịka mmanụ.
Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru. 15Mgbe m bibiri Ijipt,
kpochapụkwa ihe niile dị nʼime ya,
mgbe m tidara ndị niile bi nʼime ya,
ha ga-amata nʼezie na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ 16“Nke a bụ abụ akwa ha ga-abụrụ ya. Ndị inyom mba dị iche iche ga-abụ ya. Ha ga-abụ ya nʼihi Ijipt na usuu ndị agha ya, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.” 17Nʼafọ nke iri na abụọ ahụ, nʼụbọchị nke iri na ise nke ọnwa ahụ, okwu nke Onyenwe anyị rutere m ntị sị,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.