Izikiel 32:17
Ezekiel 32:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼafọ nke iri na abụọ ahụ, nʼụbọchị nke iri na ise nke ọnwa ahụ, okwu nke Onyenwe anyị rutere m ntị sị,
Ezekiel 32:17 in English
Ezekiel 32:17 · Berean Standard Bible
In the twelfth year, on the fifteenth day of the month,* the word of the LORD came to me, saying,
Context
15Mgbe m bibiri Ijipt,
kpochapụkwa ihe niile dị nʼime ya,
mgbe m tidara ndị niile bi nʼime ya,
ha ga-amata nʼezie na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ 16“Nke a bụ abụ akwa ha ga-abụrụ ya. Ndị inyom mba dị iche iche ga-abụ ya. Ha ga-abụ ya nʼihi Ijipt na usuu ndị agha ya, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.” 17Nʼafọ nke iri na abụọ ahụ, nʼụbọchị nke iri na ise nke ọnwa ahụ, okwu nke Onyenwe anyị rutere m ntị sị, 18“Nwa nke mmadụ, tie mkpu akwa nʼihi usuu ndị agha Ijipt niile, wezuga ha baa nʼokpuru ụwa ma ndị inyom mba dị iche iche dị ukwuu, ha na ndị ahụ na-arịdaru nʼolulu. 19Gwa ha okwu sị ha, ‘Unu o nwere ihuọma karịa ndị ọzọ? Lee, ihe na-eche gị bụ olulu. Ọ bụkwa ndị a na-ebighị ugwu ka ị ga-edinakwuru.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.