Izikiel 32:18
Ezekiel 32:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nwa nke mmadụ, tie mkpu akwa nʼihi usuu ndị agha Ijipt niile, wezuga ha baa nʼokpuru ụwa ma ndị inyom mba dị iche iche dị ukwuu, ha na ndị ahụ na-arịdaru nʼolulu.
Ezekiel 32:18 in English
Ezekiel 32:18 · Berean Standard Bible
“Son of man, wail for the multitudes of Egypt, and consign her and the daughters of the mighty nations to the depths of the earth with those who descend to the Pit:
Context
16“Nke a bụ abụ akwa ha ga-abụrụ ya. Ndị inyom mba dị iche iche ga-abụ ya. Ha ga-abụ ya nʼihi Ijipt na usuu ndị agha ya, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.” 17Nʼafọ nke iri na abụọ ahụ, nʼụbọchị nke iri na ise nke ọnwa ahụ, okwu nke Onyenwe anyị rutere m ntị sị, 18“Nwa nke mmadụ, tie mkpu akwa nʼihi usuu ndị agha Ijipt niile, wezuga ha baa nʼokpuru ụwa ma ndị inyom mba dị iche iche dị ukwuu, ha na ndị ahụ na-arịdaru nʼolulu. 19Gwa ha okwu sị ha, ‘Unu o nwere ihuọma karịa ndị ọzọ? Lee, ihe na-eche gị bụ olulu. Ọ bụkwa ndị a na-ebighị ugwu ka ị ga-edinakwuru.’ 20Nʼetiti ndị e ji mma agha gbuo ka ha ga-ada. Amịpụtala mma agha maka ya, ka a dọkpụrụ ya na igwe ndị ya niile pụọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.