Izikiel 32:8
Ezekiel 32:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe niile nke na-enye ìhè nʼeluigwe ka m ga-eme ka ha jie nji nʼelu gị, mee ka ọchịchịrị gbachie nʼala gị niile, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.
Ezekiel 32:8 in English
Ezekiel 32:8 · Berean Standard Bible
All the shining lights in the heavens I will darken over you, and I will bring darkness upon your land,’ declares the Lord GOD.
Context
6M ga-eji ọbara gị na-asọ asọ dee ala niile dịka mmiri
ọ bụladị ruo nʼugwu niile,
ebe niile mmiri si erufe ga-ejupụtakwa nʼanụ ahụ gị. 7Mgbe m ga-emenyụ gị dịka ọkụ, aga m ekpuchi ihu eluigwe,
meekwa ka kpakpando niile jie nji.
Aga m eji igwe ojii mechie ihu anyanwụ,
ọnwa agakwaghị enye ìhè ya. 8Ihe niile nke na-enye ìhè nʼeluigwe
ka m ga-eme ka ha jie nji nʼelu gị,
mee ka ọchịchịrị gbachie nʼala gị niile, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya. 9Aga m eweta obi mgbawa nʼetiti ndị mmadụ dị iche iche
mgbe m ga-eme ka mbibi gị bịa nʼetiti mba niile
nʼime ala dị iche iche nke ị na-amaghị. 10Aga m eme ka i ju ọtụtụ ndị mmadụ anya,*
ndị eze ha ga-ama jijiji nʼụjọ maka gị
mgbe m ga-efegharị mma agha m nʼihu ha.
Onye ọbụla nʼime ha ga-ama jijiji*
na ntabi anya ọbụla nʼihi ndụ ya
nʼụbọchị ahụ, ị ga-ada.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.