Izikiel 32:6
Ezekiel 32:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
M ga-eji ọbara gị na-asọ asọ dee ala niile dịka mmiri ọ bụladị ruo nʼugwu niile, ebe niile mmiri si erufe ga-ejupụtakwa nʼanụ ahụ gị.
Ezekiel 32:6 in English
Ezekiel 32:6 · Berean Standard Bible
I will drench the land with the flow of your blood, all the way to the mountains— the ravines will be filled.
Context
4Aga m atụsa gị nʼala,
nʼọhịa ka m ga-atụfukwa gị,
meekwa ka ụmụ nnụnụ niile nke eluigwe bekwasị gị.
Aga m emekwa ka anụ ọhịa nke ụwa niile rijuo afọ nʼanụ ahụ gị. 5Aga m tụsasịkwa anụ ahụ gị nʼugwu niile,
werekwa ihe ọbụla fọdụrụ nʼime gị mejuo ndagwurugwu niile. 6M ga-eji ọbara gị na-asọ asọ dee ala niile dịka mmiri
ọ bụladị ruo nʼugwu niile,
ebe niile mmiri si erufe ga-ejupụtakwa nʼanụ ahụ gị. 7Mgbe m ga-emenyụ gị dịka ọkụ, aga m ekpuchi ihu eluigwe,
meekwa ka kpakpando niile jie nji.
Aga m eji igwe ojii mechie ihu anyanwụ,
ọnwa agakwaghị enye ìhè ya. 8Ihe niile nke na-enye ìhè nʼeluigwe
ka m ga-eme ka ha jie nji nʼelu gị,
mee ka ọchịchịrị gbachie nʼala gị niile, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.