Izikiel 32:5
Ezekiel 32:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m tụsasịkwa anụ ahụ gị nʼugwu niile, werekwa ihe ọbụla fọdụrụ nʼime gị mejuo ndagwurugwu niile.
Ezekiel 32:5 in English
Ezekiel 32:5 · Berean Standard Bible
I will put your flesh on the mountains and fill the valleys with your remains.*
Context
3“ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị,
“ ‘Aga m eji ọtụtụ ndị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ
gbasaa ụgbụ m nʼelu gị.
Ha ga-adọkpụkwara gị nʼime ụgbụ m. 4Aga m atụsa gị nʼala,
nʼọhịa ka m ga-atụfukwa gị,
meekwa ka ụmụ nnụnụ niile nke eluigwe bekwasị gị.
Aga m emekwa ka anụ ọhịa nke ụwa niile rijuo afọ nʼanụ ahụ gị. 5Aga m tụsasịkwa anụ ahụ gị nʼugwu niile,
werekwa ihe ọbụla fọdụrụ nʼime gị mejuo ndagwurugwu niile. 6M ga-eji ọbara gị na-asọ asọ dee ala niile dịka mmiri
ọ bụladị ruo nʼugwu niile,
ebe niile mmiri si erufe ga-ejupụtakwa nʼanụ ahụ gị. 7Mgbe m ga-emenyụ gị dịka ọkụ, aga m ekpuchi ihu eluigwe,
meekwa ka kpakpando niile jie nji.
Aga m eji igwe ojii mechie ihu anyanwụ,
ọnwa agakwaghị enye ìhè ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.