Native Bible

Ezekiel 32:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Aga m tụsasịkwa anụ ahụ gị nʼugwu niile, werekwa ihe ọbụla fọdụrụ nʼime gị mejuo ndagwurugwu niile.

Ezekiel 32:5 in English

Ezekiel 32:5 · Berean Standard Bible

I will put your flesh on the mountains and fill the valleys with your remains.*

Context

3“ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, “ ‘Aga m eji ọtụtụ ndị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ gbasaa ụgbụ m nʼelu gị. Ha ga-adọkpụkwara gị nʼime ụgbụ m. 4Aga m atụsa gị nʼala, nʼọhịa ka m ga-atụfukwa gị, meekwa ka ụmụ nnụnụ niile nke eluigwe bekwasị gị. Aga m emekwa ka anụ ọhịa nke ụwa niile rijuo afọ nʼanụ ahụ gị. 5Aga m tụsasịkwa anụ ahụ gị nʼugwu niile, werekwa ihe ọbụla fọdụrụ nʼime gị mejuo ndagwurugwu niile. 6M ga-eji ọbara gị na-asọ asọ dee ala niile dịka mmiri ọ bụladị ruo nʼugwu niile, ebe niile mmiri si erufe ga-ejupụtakwa nʼanụ ahụ gị. 7Mgbe m ga-emenyụ gị dịka ọkụ, aga m ekpuchi ihu eluigwe, meekwa ka kpakpando niile jie nji. Aga m eji igwe ojii mechie ihu anyanwụ, ọnwa agakwaghị enye ìhè ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.