Native Bible

Ezekiel 32:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Aga m atụsa gị nʼala, nʼọhịa ka m ga-atụfukwa gị, meekwa ka ụmụ nnụnụ niile nke eluigwe bekwasị gị. Aga m emekwa ka anụ ọhịa nke ụwa niile rijuo afọ nʼanụ ahụ gị.

Ezekiel 32:4 in English

Ezekiel 32:4 · Berean Standard Bible

I will abandon you on the land and hurl you into the open field. I will cause all the birds of the air to settle upon you, and all the beasts of the earth to eat their fill of you.

Context

2“Nwa nke mmadụ, buliere Fero bụ eze Ijipt, abụ akwa sị ya, “ ‘Ị dị ka ọdụm nʼetiti mba niile. Ị dịkwa ka ogologo anụ ọjọọ na-anọ nʼosimiri. I na-akpụgharị onwe gị nʼime mmiri. I ji ụkwụ abụọ na-agbarụ mmiri, na-emekwa ka mmiri iyi niile gbarụọ. 3“ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, “ ‘Aga m eji ọtụtụ ndị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ gbasaa ụgbụ m nʼelu gị. Ha ga-adọkpụkwara gị nʼime ụgbụ m. 4Aga m atụsa gị nʼala, nʼọhịa ka m ga-atụfukwa gị, meekwa ka ụmụ nnụnụ niile nke eluigwe bekwasị gị. Aga m emekwa ka anụ ọhịa nke ụwa niile rijuo afọ nʼanụ ahụ gị. 5Aga m tụsasịkwa anụ ahụ gị nʼugwu niile, werekwa ihe ọbụla fọdụrụ nʼime gị mejuo ndagwurugwu niile. 6M ga-eji ọbara gị na-asọ asọ dee ala niile dịka mmiri ọ bụladị ruo nʼugwu niile, ebe niile mmiri si erufe ga-ejupụtakwa nʼanụ ahụ gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.