Native Bible

Ecclesiastes 12:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, anụ ahụ anyị ga-alaghachi nʼaja ebe o si pụta;* mmụọ* anyị ga-alaghachikwuru Chineke onye nyere ya.

Ecclesiastes 12:7 in English

Ecclesiastes 12:7 · Berean Standard Bible

before the dust returns to the ground from which it came and the spirit returns to God who gave it.

Context

5mgbe ndị mmadụ ga-atụ egwu ebe dị elu; na ihe egwu nke okporoụzọ, mgbe osisi alụmọnd ga-ama ifuru mgbe ụkpana ga na-adọkpụ onwe ya nʼụzọ, agụụ ihe ọbụla ga-akwụsịkwa. Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-ala ụlọ ebighị ebi ya, ndị na-akwa akwa ga na-agagharị nʼokporoụzọ niile. 6E, cheta ya, tupu e gbubie ụdọ ọlaọcha ahụ, tupu e tiwaa ọkwa ọlaedo, tupu ite adawaa nʼisi iyi, tupu e tijie ụkwụ igwe olulu mmiri. 7Mgbe ahụ, anụ ahụ anyị ga-alaghachi nʼaja ebe o si pụta;* mmụọ* anyị ga-alaghachikwuru Chineke onye nyere ya. 8“Ihe efu! Ihe efu!” ka onye ozizi kwuru. “Ihe niile bụ ihe efu!” 9Ọ bụghị naanị nʼonye ozizi ahụ bụ onye maara ihe, o jegharịrị na-ezi ndị mmadụ ihe ọ maara. Ọ tụgharịrị uche chọpụta ọtụtụ ilu, detuokwa ha nʼusoro.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.