Ekiliziastis 12:8
Ecclesiastes 12:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ihe efu! Ihe efu!” ka onye ozizi kwuru. “Ihe niile bụ ihe efu!”
Ecclesiastes 12:8 in English
Ecclesiastes 12:8 · Berean Standard Bible
“Futility of futilities,” says the Teacher. “Everything is futile!”
Context
6E, cheta ya, tupu e gbubie ụdọ ọlaọcha ahụ,
tupu e tiwaa ọkwa ọlaedo,
tupu ite adawaa nʼisi iyi,
tupu e tijie ụkwụ igwe olulu mmiri. 7Mgbe ahụ, anụ ahụ anyị ga-alaghachi nʼaja ebe o si pụta;*
mmụọ* anyị ga-alaghachikwuru Chineke onye nyere ya. 8“Ihe efu! Ihe efu!” ka onye ozizi kwuru.
“Ihe niile bụ ihe efu!” 9Ọ bụghị naanị nʼonye ozizi ahụ bụ onye maara ihe, o jegharịrị na-ezi ndị mmadụ ihe ọ maara. Ọ tụgharịrị uche chọpụta ọtụtụ ilu, detuokwa ha nʼusoro. 10Onye ozizi chọpụtara okwu ndị dabanyere nʼusoro, ihe o depụtara bụ ihe ziri ezi na eziokwu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.