Native Bible

Ecclesiastes 12:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụghị naanị nʼonye ozizi ahụ bụ onye maara ihe, o jegharịrị na-ezi ndị mmadụ ihe ọ maara. Ọ tụgharịrị uche chọpụta ọtụtụ ilu, detuokwa ha nʼusoro.

Ecclesiastes 12:9 in English

Ecclesiastes 12:9 · Berean Standard Bible

Not only was the Teacher wise, but he also taught the people knowledge; he pondered, searched out, and arranged many proverbs.

Context

7Mgbe ahụ, anụ ahụ anyị ga-alaghachi nʼaja ebe o si pụta;* mmụọ* anyị ga-alaghachikwuru Chineke onye nyere ya. 8“Ihe efu! Ihe efu!” ka onye ozizi kwuru. “Ihe niile bụ ihe efu!” 9Ọ bụghị naanị nʼonye ozizi ahụ bụ onye maara ihe, o jegharịrị na-ezi ndị mmadụ ihe ọ maara. Ọ tụgharịrị uche chọpụta ọtụtụ ilu, detuokwa ha nʼusoro. 10Onye ozizi chọpụtara okwu ndị dabanyere nʼusoro, ihe o depụtara bụ ihe ziri ezi na eziokwu. 11Okwu ọnụ nke onye maara ihe dị ka ndụdụ e ji achụ ehi. Nchịkọta okwu amamihe ndị a dị ka ǹtu a kumiri nke ọma, nke onye na-azụ atụrụ nyere.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.