Native Bible

Ecclesiastes 12:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Okwu ọnụ nke onye maara ihe dị ka ndụdụ e ji achụ ehi. Nchịkọta okwu amamihe ndị a dị ka ǹtu a kumiri nke ọma, nke onye na-azụ atụrụ nyere.

Ecclesiastes 12:11 in English

Ecclesiastes 12:11 · Berean Standard Bible

The words of the wise are like goads, and the anthologies of the masters are like firmly embedded nails driven by a single Shepherd.*

Context

9Ọ bụghị naanị nʼonye ozizi ahụ bụ onye maara ihe, o jegharịrị na-ezi ndị mmadụ ihe ọ maara. Ọ tụgharịrị uche chọpụta ọtụtụ ilu, detuokwa ha nʼusoro. 10Onye ozizi chọpụtara okwu ndị dabanyere nʼusoro, ihe o depụtara bụ ihe ziri ezi na eziokwu. 11Okwu ọnụ nke onye maara ihe dị ka ndụdụ e ji achụ ehi. Nchịkọta okwu amamihe ndị a dị ka ǹtu a kumiri nke ọma, nke onye na-azụ atụrụ nyere. 12Ma nwa m nwoke lezie anya, atụkwasịla ihe ọzọ nʼelu ihe ndị a. Akwụkwọ a na-ede ede enweghị ọgwụgwụ, ọtụtụ mmụta na-agwụ ike. 13Ugbu a anụla ihe ndị a niile, ma nụrụ ihe bụ nkwubi okwu: Tụọ egwu Chineke, debekwa iwu ya niile, nʼihi na nke a bụ ọrụ niile dịrị mmadụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.