Native Bible

Ecclesiastes 12:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

E, cheta ya, tupu e gbubie ụdọ ọlaọcha ahụ, tupu e tiwaa ọkwa ọlaedo, tupu ite adawaa nʼisi iyi, tupu e tijie ụkwụ igwe olulu mmiri.

Ecclesiastes 12:6 in English

Ecclesiastes 12:6 · Berean Standard Bible

Remember Him before the silver cord is snapped and the golden bowl is crushed, before the pitcher is shattered at the spring and the wheel is broken at the well,

Context

4mgbe e mechiri ọnụ ụzọ nke pụrụ nʼokporoụzọ, mgbe olu ịkwọ nri ga-adị ala, mgbe ụda olu abụ ụmụ nnụnụ ga-akpọte ndị mmadụ, ma abụ ha niile na-ala ala, 5mgbe ndị mmadụ ga-atụ egwu ebe dị elu; na ihe egwu nke okporoụzọ, mgbe osisi alụmọnd ga-ama ifuru mgbe ụkpana ga na-adọkpụ onwe ya nʼụzọ, agụụ ihe ọbụla ga-akwụsịkwa. Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-ala ụlọ ebighị ebi ya, ndị na-akwa akwa ga na-agagharị nʼokporoụzọ niile. 6E, cheta ya, tupu e gbubie ụdọ ọlaọcha ahụ, tupu e tiwaa ọkwa ọlaedo, tupu ite adawaa nʼisi iyi, tupu e tijie ụkwụ igwe olulu mmiri. 7Mgbe ahụ, anụ ahụ anyị ga-alaghachi nʼaja ebe o si pụta;* mmụọ* anyị ga-alaghachikwuru Chineke onye nyere ya. 8“Ihe efu! Ihe efu!” ka onye ozizi kwuru. “Ihe niile bụ ihe efu!”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.