Ekiliziastis 12:5
Ecclesiastes 12:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
mgbe ndị mmadụ ga-atụ egwu ebe dị elu; na ihe egwu nke okporoụzọ, mgbe osisi alụmọnd ga-ama ifuru mgbe ụkpana ga na-adọkpụ onwe ya nʼụzọ, agụụ ihe ọbụla ga-akwụsịkwa. Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-ala ụlọ ebighị ebi ya, ndị na-akwa akwa ga na-agagharị nʼokporoụzọ niile.
Ecclesiastes 12:5 in English
Ecclesiastes 12:5 · Berean Standard Bible
when men fear the heights and dangers of the road, when the almond tree blossoms, the grasshopper loses its spring, and the caper berry shrivels— for then man goes to his eternal home and mourners walk the streets.
Context
3Mgbe ndị na-echebe ụlọ ga-ama jijiji,
mgbe ndị dimkpa nwoke ga-ehulata,
mgbe ndị na-akwọ ihe kwụsịrị maka ha dị ole na ole,
mgbe ndị na-elepụ anya site nʼoghere ga-ebido ịgba ọchịchịrị, 4mgbe e mechiri ọnụ ụzọ nke pụrụ nʼokporoụzọ,
mgbe olu ịkwọ nri ga-adị ala,
mgbe ụda olu abụ ụmụ nnụnụ ga-akpọte ndị mmadụ,
ma abụ ha niile na-ala ala, 5mgbe ndị mmadụ ga-atụ egwu ebe dị elu;
na ihe egwu nke okporoụzọ,
mgbe osisi alụmọnd ga-ama ifuru
mgbe ụkpana ga na-adọkpụ onwe ya nʼụzọ,
agụụ ihe ọbụla ga-akwụsịkwa.
Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-ala ụlọ ebighị ebi ya,
ndị na-akwa akwa ga na-agagharị nʼokporoụzọ niile. 6E, cheta ya, tupu e gbubie ụdọ ọlaọcha ahụ,
tupu e tiwaa ọkwa ọlaedo,
tupu ite adawaa nʼisi iyi,
tupu e tijie ụkwụ igwe olulu mmiri. 7Mgbe ahụ, anụ ahụ anyị ga-alaghachi nʼaja ebe o si pụta;*
mmụọ* anyị ga-alaghachikwuru Chineke onye nyere ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.