Zefanaya 1:5
Zephaniah 1:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
bụ ndị ahụ niile na-anọ nʼelu ụlọ ha na-akpọ isiala nye ọnwa na kpakpando, ha na ndị ahụ niile na-akpọrọ Onyenwe anyị isiala, na-eji aha ya nʼaṅụ iyi, ma na-ejikwa Milkọm* na-aṅụ iyi,
Zephaniah 1:5 in English
Zephaniah 1:5 · Berean Standard Bible
those who bow on the rooftops to worship the host of heaven, those who bow down and swear by the LORD but also swear by Milcom,*
Context
3“Aga m azachapụ mmadụ na anụmanụ.
Aga m azachapụ ụmụ anụ ufe niile nke dị nʼeluigwe,
zachapụkwa azụ niile nke dị nʼosimiri,
na arụsị niile dị iche iche nke na-eme ka ndị ajọ mmadụ sụọ ngọngọ.”
“Mgbe m kpochapụrụ* mmadụ niile
site nʼelu ụwa,”
otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 4“Aga m esetipụ aka m megide Juda,
megidekwa ndị niile bi na Jerusalem.
Aga m ebipụkwa ndị niile na-efe Baal fọdụrụ nʼebe a,
na aha ndị nchụaja arụsị niile, ma ndị nchụaja niile na-ekpere arụsị, 5bụ ndị ahụ niile na-anọ nʼelu ụlọ ha
na-akpọ isiala nye ọnwa na kpakpando,
ha na ndị ahụ niile na-akpọrọ Onyenwe anyị isiala, na-eji aha ya nʼaṅụ iyi,
ma na-ejikwa Milkọm* na-aṅụ iyi, 6na ndị ahụ niile na-alaghachi azụ site nʼiso Onyenwe anyị,
na ndị ahụ na-adịghị achọ Onyenwe anyị, maọbụ jụta ase site nʼaka ya.” 7Dere duu nʼihu Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị
nʼihi na ụbọchị ikpe ya ahụ dị egwu na-abịa nso.
Onyenwe anyị ejikerela ịchụ aja;
o doola ndị ọ kpọrọ oriri nsọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.