Native Bible

Zephaniah 1:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Aga m azachapụ mmadụ na anụmanụ. Aga m azachapụ ụmụ anụ ufe niile nke dị nʼeluigwe, zachapụkwa azụ niile nke dị nʼosimiri, na arụsị niile dị iche iche nke na-eme ka ndị ajọ mmadụ sụọ ngọngọ.” “Mgbe m kpochapụrụ* mmadụ niile site nʼelu ụwa,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

Zephaniah 1:3 in English

Zephaniah 1:3 · Berean Standard Bible

“I will sweep away man and beast; I will sweep away the birds of the air, and the fish of the sea, and the idols with their wicked worshipers.* I will cut off mankind from the face of the earth,” declares the LORD.

Context

1Okwu Onyenwe anyị nke rutere Zefanaya, nwa Kushi, nwa nwa Gedaliya, bụ nwa Amaraya. Amaraya bụ nwa Hezekaya. Ozi a bịara nʼoge Josaya nwa Amọn, bụ eze Juda. 2“Aga m azachapụ ihe niile site nʼelu ụwa,” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 3“Aga m azachapụ mmadụ na anụmanụ. Aga m azachapụ ụmụ anụ ufe niile nke dị nʼeluigwe, zachapụkwa azụ niile nke dị nʼosimiri, na arụsị niile dị iche iche nke na-eme ka ndị ajọ mmadụ sụọ ngọngọ.” “Mgbe m kpochapụrụ* mmadụ niile site nʼelu ụwa,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 4“Aga m esetipụ aka m megide Juda, megidekwa ndị niile bi na Jerusalem. Aga m ebipụkwa ndị niile na-efe Baal fọdụrụ nʼebe a, na aha ndị nchụaja arụsị niile, ma ndị nchụaja niile na-ekpere arụsị, 5bụ ndị ahụ niile na-anọ nʼelu ụlọ ha na-akpọ isiala nye ọnwa na kpakpando, ha na ndị ahụ niile na-akpọrọ Onyenwe anyị isiala, na-eji aha ya nʼaṅụ iyi, ma na-ejikwa Milkọm* na-aṅụ iyi,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.