Zefanaya 1:4
Zephaniah 1:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Aga m esetipụ aka m megide Juda, megidekwa ndị niile bi na Jerusalem. Aga m ebipụkwa ndị niile na-efe Baal fọdụrụ nʼebe a, na aha ndị nchụaja arụsị niile, ma ndị nchụaja niile na-ekpere arụsị,
Zephaniah 1:4 in English
Zephaniah 1:4 · Berean Standard Bible
“I will stretch out My hand against Judah and against all who dwell in Jerusalem. I will cut off from this place every remnant of Baal, the names of the idolatrous and pagan priests—
Context
2“Aga m azachapụ ihe niile
site nʼelu ụwa,”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 3“Aga m azachapụ mmadụ na anụmanụ.
Aga m azachapụ ụmụ anụ ufe niile nke dị nʼeluigwe,
zachapụkwa azụ niile nke dị nʼosimiri,
na arụsị niile dị iche iche nke na-eme ka ndị ajọ mmadụ sụọ ngọngọ.”
“Mgbe m kpochapụrụ* mmadụ niile
site nʼelu ụwa,”
otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 4“Aga m esetipụ aka m megide Juda,
megidekwa ndị niile bi na Jerusalem.
Aga m ebipụkwa ndị niile na-efe Baal fọdụrụ nʼebe a,
na aha ndị nchụaja arụsị niile, ma ndị nchụaja niile na-ekpere arụsị, 5bụ ndị ahụ niile na-anọ nʼelu ụlọ ha
na-akpọ isiala nye ọnwa na kpakpando,
ha na ndị ahụ niile na-akpọrọ Onyenwe anyị isiala, na-eji aha ya nʼaṅụ iyi,
ma na-ejikwa Milkọm* na-aṅụ iyi, 6na ndị ahụ niile na-alaghachi azụ site nʼiso Onyenwe anyị,
na ndị ahụ na-adịghị achọ Onyenwe anyị, maọbụ jụta ase site nʼaka ya.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.