Zefanaya 1:2
Zephaniah 1:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Aga m azachapụ ihe niile site nʼelu ụwa,” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Zephaniah 1:2 in English
Zephaniah 1:2 · Berean Standard Bible
“I will completely sweep away everything from the face of the earth,” declares the LORD.
Context
1Okwu Onyenwe anyị nke rutere Zefanaya, nwa Kushi, nwa nwa Gedaliya, bụ nwa Amaraya. Amaraya bụ nwa Hezekaya. Ozi a bịara nʼoge Josaya nwa Amọn, bụ eze Juda. 2“Aga m azachapụ ihe niile
site nʼelu ụwa,”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 3“Aga m azachapụ mmadụ na anụmanụ.
Aga m azachapụ ụmụ anụ ufe niile nke dị nʼeluigwe,
zachapụkwa azụ niile nke dị nʼosimiri,
na arụsị niile dị iche iche nke na-eme ka ndị ajọ mmadụ sụọ ngọngọ.”
“Mgbe m kpochapụrụ* mmadụ niile
site nʼelu ụwa,”
otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 4“Aga m esetipụ aka m megide Juda,
megidekwa ndị niile bi na Jerusalem.
Aga m ebipụkwa ndị niile na-efe Baal fọdụrụ nʼebe a,
na aha ndị nchụaja arụsị niile, ma ndị nchụaja niile na-ekpere arụsị,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.