Zefanaya 1:6
Zephaniah 1:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
na ndị ahụ niile na-alaghachi azụ site nʼiso Onyenwe anyị, na ndị ahụ na-adịghị achọ Onyenwe anyị, maọbụ jụta ase site nʼaka ya.”
Zephaniah 1:6 in English
Zephaniah 1:6 · Berean Standard Bible
and those who turn back from following the LORD, neither seeking the LORD nor inquiring of Him.”
Context
4“Aga m esetipụ aka m megide Juda,
megidekwa ndị niile bi na Jerusalem.
Aga m ebipụkwa ndị niile na-efe Baal fọdụrụ nʼebe a,
na aha ndị nchụaja arụsị niile, ma ndị nchụaja niile na-ekpere arụsị, 5bụ ndị ahụ niile na-anọ nʼelu ụlọ ha
na-akpọ isiala nye ọnwa na kpakpando,
ha na ndị ahụ niile na-akpọrọ Onyenwe anyị isiala, na-eji aha ya nʼaṅụ iyi,
ma na-ejikwa Milkọm* na-aṅụ iyi, 6na ndị ahụ niile na-alaghachi azụ site nʼiso Onyenwe anyị,
na ndị ahụ na-adịghị achọ Onyenwe anyị, maọbụ jụta ase site nʼaka ya.” 7Dere duu nʼihu Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị
nʼihi na ụbọchị ikpe ya ahụ dị egwu na-abịa nso.
Onyenwe anyị ejikerela ịchụ aja;
o doola ndị ọ kpọrọ oriri nsọ. 8“Nʼụbọchị ịchụ aja nke Onyenwe anyị ahụ,
aga m ata ndịisi niile
na ụmụ eze niile,
na ndị niile na-eyi uwe
e si na mba ọzọ bubata ahụhụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.