Native Bible

Zephaniah 1:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

na ndị ahụ niile na-alaghachi azụ site nʼiso Onyenwe anyị, na ndị ahụ na-adịghị achọ Onyenwe anyị, maọbụ jụta ase site nʼaka ya.”

Zephaniah 1:6 in English

Zephaniah 1:6 · Berean Standard Bible

and those who turn back from following the LORD, neither seeking the LORD nor inquiring of Him.”

Context

4“Aga m esetipụ aka m megide Juda, megidekwa ndị niile bi na Jerusalem. Aga m ebipụkwa ndị niile na-efe Baal fọdụrụ nʼebe a, na aha ndị nchụaja arụsị niile, ma ndị nchụaja niile na-ekpere arụsị, 5bụ ndị ahụ niile na-anọ nʼelu ụlọ ha na-akpọ isiala nye ọnwa na kpakpando, ha na ndị ahụ niile na-akpọrọ Onyenwe anyị isiala, na-eji aha ya nʼaṅụ iyi, ma na-ejikwa Milkọm* na-aṅụ iyi, 6na ndị ahụ niile na-alaghachi azụ site nʼiso Onyenwe anyị, na ndị ahụ na-adịghị achọ Onyenwe anyị, maọbụ jụta ase site nʼaka ya.” 7Dere duu nʼihu Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị nʼihi na ụbọchị ikpe ya ahụ dị egwu na-abịa nso. Onyenwe anyị ejikerela ịchụ aja; o doola ndị ọ kpọrọ oriri nsọ. 8“Nʼụbọchị ịchụ aja nke Onyenwe anyị ahụ, aga m ata ndịisi niile na ụmụ eze niile, na ndị niile na-eyi uwe e si na mba ọzọ bubata ahụhụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.