Native Bible

Zephaniah 1:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Dere duu nʼihu Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị nʼihi na ụbọchị ikpe ya ahụ dị egwu na-abịa nso. Onyenwe anyị ejikerela ịchụ aja; o doola ndị ọ kpọrọ oriri nsọ.

Zephaniah 1:7 in English

Zephaniah 1:7 · Berean Standard Bible

Be silent in the presence of the Lord GOD, for the Day of the LORD is near. Indeed, the LORD has prepared a sacrifice; He has consecrated His guests.

Context

5bụ ndị ahụ niile na-anọ nʼelu ụlọ ha na-akpọ isiala nye ọnwa na kpakpando, ha na ndị ahụ niile na-akpọrọ Onyenwe anyị isiala, na-eji aha ya nʼaṅụ iyi, ma na-ejikwa Milkọm* na-aṅụ iyi, 6na ndị ahụ niile na-alaghachi azụ site nʼiso Onyenwe anyị, na ndị ahụ na-adịghị achọ Onyenwe anyị, maọbụ jụta ase site nʼaka ya.” 7Dere duu nʼihu Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị nʼihi na ụbọchị ikpe ya ahụ dị egwu na-abịa nso. Onyenwe anyị ejikerela ịchụ aja; o doola ndị ọ kpọrọ oriri nsọ. 8“Nʼụbọchị ịchụ aja nke Onyenwe anyị ahụ, aga m ata ndịisi niile na ụmụ eze niile, na ndị niile na-eyi uwe e si na mba ọzọ bubata ahụhụ. 9Nʼụbọchị ahụ, aga m ata ha ahụhụ bụ ndị niile na-adịghị azọ ụkwụ nʼọnụ ụzọ mbata,** ndị ji ihe ike na aghụghọ na-emejupụta ụlọ arụsị ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.