Abụ nke Abụ 5:8
Song of Songs 5:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, ana m agba unu iyi, ọ bụrụ na unu ahụ onye m hụrụ nʼanya, gịnị ka unu ga-agwa ya? Gwa ya na abụ m onye ịhụnanya mere ka ike gwụchasịa nʼahụ.
Song of Songs 5:8 in English
Song of Songs 5:8 · Berean Standard Bible
O daughters of Jerusalem, I adjure you, if you find my beloved, tell him I am sick with love.
Context
6Mgbe m megheere onye m hụrụ nʼanya ụzọ,
ma lee, ọ nọkwaghị ya, ọ laala.
Obi fepụrụ m mgbe ọ pụwara.
Elegharịrị m anya chọọ ya ma ahụghị m ya ebe ọbụla.
Akpọrọ m ya oku ma ọ zaghị. 7Ndị nche hụrụ m
mgbe ha na-agagharị nʼobodo,*
ha tiri m ihe merụọ m ahụ.
Ndị nche mgbidi obodo
napụrụ m akwa mkpuchi m. 8Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, ana m agba unu iyi,
ọ bụrụ na unu ahụ onye m hụrụ nʼanya,
gịnị ka unu ga-agwa ya?
Gwa ya na abụ m onye ịhụnanya mere ka ike gwụchasịa nʼahụ. 9Gị nwanyị kachasị mma,
olee otu onye ị hụrụ nʼanya si dị mma karịa ndị ọzọ?
Olee otu onye ị hụrụ nʼanya si dị mma karịa ndị ọzọ
nke i ji enye anyị iwu dị otu a? 10Onye m hụrụ nʼanya chapụrụ achapụ, dị mma ile anya.
Ọ pụrụ iche nʼetiti puku ndị nwoke iri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.