Abụ nke Abụ 5:9
Song of Songs 5:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gị nwanyị kachasị mma, olee otu onye ị hụrụ nʼanya si dị mma karịa ndị ọzọ? Olee otu onye ị hụrụ nʼanya si dị mma karịa ndị ọzọ nke i ji enye anyị iwu dị otu a?
Song of Songs 5:9 in English
Song of Songs 5:9 · Berean Standard Bible
How is your beloved better than others, O most beautiful among women? How is your beloved better than another, that you charge us so?
Context
7Ndị nche hụrụ m
mgbe ha na-agagharị nʼobodo,*
ha tiri m ihe merụọ m ahụ.
Ndị nche mgbidi obodo
napụrụ m akwa mkpuchi m. 8Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, ana m agba unu iyi,
ọ bụrụ na unu ahụ onye m hụrụ nʼanya,
gịnị ka unu ga-agwa ya?
Gwa ya na abụ m onye ịhụnanya mere ka ike gwụchasịa nʼahụ. 9Gị nwanyị kachasị mma,
olee otu onye ị hụrụ nʼanya si dị mma karịa ndị ọzọ?
Olee otu onye ị hụrụ nʼanya si dị mma karịa ndị ọzọ
nke i ji enye anyị iwu dị otu a? 10Onye m hụrụ nʼanya chapụrụ achapụ, dị mma ile anya.
Ọ pụrụ iche nʼetiti puku ndị nwoke iri. 11Isi ya dịka ọlaedo a nụchara anụcha,
agịrị isi ya na-eruda dịka igu nkwụ,
na-ejikwa nji dịka ugolọma.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.