Abụ nke Abụ 5:11
Song of Songs 5:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Isi ya dịka ọlaedo a nụchara anụcha, agịrị isi ya na-eruda dịka igu nkwụ, na-ejikwa nji dịka ugolọma.
Song of Songs 5:11 in English
Song of Songs 5:11 · Berean Standard Bible
His head is purest gold; his hair is wavy and black as a raven.
Context
9Gị nwanyị kachasị mma,
olee otu onye ị hụrụ nʼanya si dị mma karịa ndị ọzọ?
Olee otu onye ị hụrụ nʼanya si dị mma karịa ndị ọzọ
nke i ji enye anyị iwu dị otu a? 10Onye m hụrụ nʼanya chapụrụ achapụ, dị mma ile anya.
Ọ pụrụ iche nʼetiti puku ndị nwoke iri. 11Isi ya dịka ọlaedo a nụchara anụcha,
agịrị isi ya na-eruda dịka igu nkwụ,
na-ejikwa nji dịka ugolọma. 12Anya ya abụọ dịka nduru*
nọ nʼakụkụ mmiri iyi
nke e jiri mmiri ara ehi sachaa,
dịka nkume dị oke ọnụahịa e doro nʼahịrị. 13Nti ya abụọ dị ka ihe ndina ụda*
nke jupụtara na mmanụ isi ụtọ.
Egbugbere ọnụ ya dị ka okoko urodi,
nke na-agbụsị mmanụ máá.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.