Abụ nke Abụ 5:10
Song of Songs 5:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye m hụrụ nʼanya chapụrụ achapụ, dị mma ile anya. Ọ pụrụ iche nʼetiti puku ndị nwoke iri.
Song of Songs 5:10 in English
Song of Songs 5:10 · Berean Standard Bible
My beloved is dazzling and ruddy, outstanding among ten thousand.
Context
8Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, ana m agba unu iyi,
ọ bụrụ na unu ahụ onye m hụrụ nʼanya,
gịnị ka unu ga-agwa ya?
Gwa ya na abụ m onye ịhụnanya mere ka ike gwụchasịa nʼahụ. 9Gị nwanyị kachasị mma,
olee otu onye ị hụrụ nʼanya si dị mma karịa ndị ọzọ?
Olee otu onye ị hụrụ nʼanya si dị mma karịa ndị ọzọ
nke i ji enye anyị iwu dị otu a? 10Onye m hụrụ nʼanya chapụrụ achapụ, dị mma ile anya.
Ọ pụrụ iche nʼetiti puku ndị nwoke iri. 11Isi ya dịka ọlaedo a nụchara anụcha,
agịrị isi ya na-eruda dịka igu nkwụ,
na-ejikwa nji dịka ugolọma. 12Anya ya abụọ dịka nduru*
nọ nʼakụkụ mmiri iyi
nke e jiri mmiri ara ehi sachaa,
dịka nkume dị oke ọnụahịa e doro nʼahịrị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.