Abụ nke Abụ 5:12
Song of Songs 5:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Anya ya abụọ dịka nduru* nọ nʼakụkụ mmiri iyi nke e jiri mmiri ara ehi sachaa, dịka nkume dị oke ọnụahịa e doro nʼahịrị.
Song of Songs 5:12 in English
Song of Songs 5:12 · Berean Standard Bible
His eyes are like doves beside the streams of water, bathed in milk and mounted like jewels.
Context
10Onye m hụrụ nʼanya chapụrụ achapụ, dị mma ile anya.
Ọ pụrụ iche nʼetiti puku ndị nwoke iri. 11Isi ya dịka ọlaedo a nụchara anụcha,
agịrị isi ya na-eruda dịka igu nkwụ,
na-ejikwa nji dịka ugolọma. 12Anya ya abụọ dịka nduru*
nọ nʼakụkụ mmiri iyi
nke e jiri mmiri ara ehi sachaa,
dịka nkume dị oke ọnụahịa e doro nʼahịrị. 13Nti ya abụọ dị ka ihe ndina ụda*
nke jupụtara na mmanụ isi ụtọ.
Egbugbere ọnụ ya dị ka okoko urodi,
nke na-agbụsị mmanụ máá. 14Aka ya abụọ dị ka mkpara ọlaedo a kpụziri akpụzi,
nke a hịọnyere nkume oke ọnụahịa beril nʼime ya.
Ahụ ya na-akwọ mụrụmụrụ dịka ọdụ
nke e ji nkume dị oke ọnụahịa safaia chọọ mma.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.