Native Bible

Song of Songs 5:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Aka ya abụọ dị ka mkpara ọlaedo a kpụziri akpụzi, nke a hịọnyere nkume oke ọnụahịa beril nʼime ya. Ahụ ya na-akwọ mụrụmụrụ dịka ọdụ nke e ji nkume dị oke ọnụahịa safaia chọọ mma.

Song of Songs 5:14 in English

Song of Songs 5:14 · Berean Standard Bible

His arms are rods of gold set with beryl. His body is an ivory panel bedecked with sapphires.

Context

12Anya ya abụọ dịka nduru* nọ nʼakụkụ mmiri iyi nke e jiri mmiri ara ehi sachaa, dịka nkume dị oke ọnụahịa e doro nʼahịrị. 13Nti ya abụọ dị ka ihe ndina ụda* nke jupụtara na mmanụ isi ụtọ. Egbugbere ọnụ ya dị ka okoko urodi, nke na-agbụsị mmanụ máá. 14Aka ya abụọ dị ka mkpara ọlaedo a kpụziri akpụzi, nke a hịọnyere nkume oke ọnụahịa beril nʼime ya. Ahụ ya na-akwọ mụrụmụrụ dịka ọdụ nke e ji nkume dị oke ọnụahịa safaia chọọ mma. 15Ogwe ụkwụ ya abụọ dị ka ogidi e ji nkume mabụl kpụọ, nke e ji ọlaedo a ṅụchara anụcha tọọ ntọala ha. Ụdịdị ya dị ka Lebanọn, dịkwa oke ọnụ dịka osisi sida ya. 16Ọnụ ya bụ ihe tọkarịsịrị ụtọ nʼonwe ya, ihe niile banyere ya dị mma nʼile anya. Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, onye dị otu a bụ onye ahụ m hụrụ nʼanya, ọ bụkwa enyi m. 5:2 Mkp 3:20 5:7 Abk 3:3 5:12 Abk 1:15; 4:1 5:13 Ụda nwere isisi ọma nke na-eme mmadụ obi ụtọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.