Abụ nke Abụ 5:16
Song of Songs 5:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọnụ ya bụ ihe tọkarịsịrị ụtọ nʼonwe ya, ihe niile banyere ya dị mma nʼile anya. Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, onye dị otu a bụ onye ahụ m hụrụ nʼanya, ọ bụkwa enyi m. 5:2 Mkp 3:20 5:7 Abk 3:3 5:12 Abk 1:15; 4:1 5:13 Ụda nwere isisi ọma nke na-eme mmadụ obi ụtọ.
Song of Songs 5:16 in English
Song of Songs 5:16 · Berean Standard Bible
His mouth * is most sweet; he is altogether lovely. This is my beloved, and this is my friend, O daughters of Jerusalem.
Context
14Aka ya abụọ dị ka mkpara ọlaedo a kpụziri akpụzi,
nke a hịọnyere nkume oke ọnụahịa beril nʼime ya.
Ahụ ya na-akwọ mụrụmụrụ dịka ọdụ
nke e ji nkume dị oke ọnụahịa safaia chọọ mma. 15Ogwe ụkwụ ya abụọ dị ka ogidi e ji nkume mabụl kpụọ,
nke e ji ọlaedo a ṅụchara anụcha tọọ ntọala ha.
Ụdịdị ya dị ka Lebanọn,
dịkwa oke ọnụ dịka osisi sida ya. 16Ọnụ ya bụ ihe tọkarịsịrị ụtọ nʼonwe ya,
ihe niile banyere ya dị mma nʼile anya.
Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem,
onye dị otu a bụ onye ahụ m hụrụ nʼanya, ọ bụkwa enyi m.
5:2 Mkp 3:20
5:7 Abk 3:3
5:12 Abk 1:15; 4:1
5:13 Ụda nwere isisi ọma nke na-eme mmadụ obi ụtọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.