Abụ nke Abụ 5:13
Song of Songs 5:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nti ya abụọ dị ka ihe ndina ụda* nke jupụtara na mmanụ isi ụtọ. Egbugbere ọnụ ya dị ka okoko urodi, nke na-agbụsị mmanụ máá.
Song of Songs 5:13 in English
Song of Songs 5:13 · Berean Standard Bible
His cheeks are like beds of spice, towers of perfume. His lips are like lilies, dripping with flowing myrrh.
Context
11Isi ya dịka ọlaedo a nụchara anụcha,
agịrị isi ya na-eruda dịka igu nkwụ,
na-ejikwa nji dịka ugolọma. 12Anya ya abụọ dịka nduru*
nọ nʼakụkụ mmiri iyi
nke e jiri mmiri ara ehi sachaa,
dịka nkume dị oke ọnụahịa e doro nʼahịrị. 13Nti ya abụọ dị ka ihe ndina ụda*
nke jupụtara na mmanụ isi ụtọ.
Egbugbere ọnụ ya dị ka okoko urodi,
nke na-agbụsị mmanụ máá. 14Aka ya abụọ dị ka mkpara ọlaedo a kpụziri akpụzi,
nke a hịọnyere nkume oke ọnụahịa beril nʼime ya.
Ahụ ya na-akwọ mụrụmụrụ dịka ọdụ
nke e ji nkume dị oke ọnụahịa safaia chọọ mma. 15Ogwe ụkwụ ya abụọ dị ka ogidi e ji nkume mabụl kpụọ,
nke e ji ọlaedo a ṅụchara anụcha tọọ ntọala ha.
Ụdịdị ya dị ka Lebanọn,
dịkwa oke ọnụ dịka osisi sida ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.