Abụ nke Abụ 5:7
Song of Songs 5:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị nche hụrụ m mgbe ha na-agagharị nʼobodo,* ha tiri m ihe merụọ m ahụ. Ndị nche mgbidi obodo napụrụ m akwa mkpuchi m.
Song of Songs 5:7 in English
Song of Songs 5:7 · Berean Standard Bible
I encountered the watchmen on their rounds of the city. They beat me and bruised me; they took away my cloak, those guardians of the walls.
Context
5Mụ onwe m biliri imeghere onye m hụrụ nʼanya ụzọ,
ma aka m abụọ jupụtakwara na mmanụ máá,
mmanụ máá si na mkpịsịaka m niile na-atapụsi,
nʼelu ihe mkpọchi nke ibo. 6Mgbe m megheere onye m hụrụ nʼanya ụzọ,
ma lee, ọ nọkwaghị ya, ọ laala.
Obi fepụrụ m mgbe ọ pụwara.
Elegharịrị m anya chọọ ya ma ahụghị m ya ebe ọbụla.
Akpọrọ m ya oku ma ọ zaghị. 7Ndị nche hụrụ m
mgbe ha na-agagharị nʼobodo,*
ha tiri m ihe merụọ m ahụ.
Ndị nche mgbidi obodo
napụrụ m akwa mkpuchi m. 8Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, ana m agba unu iyi,
ọ bụrụ na unu ahụ onye m hụrụ nʼanya,
gịnị ka unu ga-agwa ya?
Gwa ya na abụ m onye ịhụnanya mere ka ike gwụchasịa nʼahụ. 9Gị nwanyị kachasị mma,
olee otu onye ị hụrụ nʼanya si dị mma karịa ndị ọzọ?
Olee otu onye ị hụrụ nʼanya si dị mma karịa ndị ọzọ
nke i ji enye anyị iwu dị otu a?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.