Native Bible

Song of Songs 5:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe m megheere onye m hụrụ nʼanya ụzọ, ma lee, ọ nọkwaghị ya, ọ laala. Obi fepụrụ m mgbe ọ pụwara. Elegharịrị m anya chọọ ya ma ahụghị m ya ebe ọbụla. Akpọrọ m ya oku ma ọ zaghị.

Song of Songs 5:6 in English

Song of Songs 5:6 · Berean Standard Bible

I opened for my beloved, but he had turned and gone. My heart sank at his departure. I sought him, but did not find him. I called, but he did not answer.

Context

4Onye m hụrụ nʼanya gbatịrị aka ya imeghe ụzọ, mgbe ahụ, obi m chọsikwara ya ike. 5Mụ onwe m biliri imeghere onye m hụrụ nʼanya ụzọ, ma aka m abụọ jupụtakwara na mmanụ máá, mmanụ máá si na mkpịsịaka m niile na-atapụsi, nʼelu ihe mkpọchi nke ibo. 6Mgbe m megheere onye m hụrụ nʼanya ụzọ, ma lee, ọ nọkwaghị ya, ọ laala. Obi fepụrụ m mgbe ọ pụwara. Elegharịrị m anya chọọ ya ma ahụghị m ya ebe ọbụla. Akpọrọ m ya oku ma ọ zaghị. 7Ndị nche hụrụ m mgbe ha na-agagharị nʼobodo,* ha tiri m ihe merụọ m ahụ. Ndị nche mgbidi obodo napụrụ m akwa mkpuchi m. 8Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, ana m agba unu iyi, ọ bụrụ na unu ahụ onye m hụrụ nʼanya, gịnị ka unu ga-agwa ya? Gwa ya na abụ m onye ịhụnanya mere ka ike gwụchasịa nʼahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.