Abụ nke Abụ 5:4
Song of Songs 5:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye m hụrụ nʼanya gbatịrị aka ya imeghe ụzọ, mgbe ahụ, obi m chọsikwara ya ike.
Song of Songs 5:4 in English
Song of Songs 5:4 · Berean Standard Bible
My beloved put his hand to the latch; my heart pounded for him.
Context
2(1) Rie, ṅụọkwa, unu ndị bụ enyi;
ṅụjuo afọ, unu ndị hụrụ onwe unu nʼanya. 3(2) A rahụrụ m ụra, ma obi m mụ anya.
Gee ntị, onye ahụ m hụrụ nʼanya na-akụ aka nʼibo ọnụ ụzọ.*
“Megheere m ụzọ, nwanne m nwanyị, onye m hụrụ nʼanya,
nduru m, onye na-enweghị ntụpọ.
Igirigi ezokwasịla m nʼisi,
agịrị isi m jupụtara na mmiri nke abalị.”
(3) Eyipụlarị m uwe m.
Ọ bụ m yirikwa ha ọzọ?
Asaala m ụkwụ m,
aga m eme ka ha ruo unyi ọzọ? 4Onye m hụrụ nʼanya gbatịrị aka ya imeghe ụzọ,
mgbe ahụ, obi m chọsikwara ya ike. 5Mụ onwe m biliri imeghere onye m hụrụ nʼanya ụzọ,
ma aka m abụọ jupụtakwara na mmanụ máá,
mmanụ máá si na mkpịsịaka m niile na-atapụsi,
nʼelu ihe mkpọchi nke ibo. 6Mgbe m megheere onye m hụrụ nʼanya ụzọ,
ma lee, ọ nọkwaghị ya, ọ laala.
Obi fepụrụ m mgbe ọ pụwara.
Elegharịrị m anya chọọ ya ma ahụghị m ya ebe ọbụla.
Akpọrọ m ya oku ma ọ zaghị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.