Abụ nke Abụ 5:3
Song of Songs 5:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
(2) A rahụrụ m ụra, ma obi m mụ anya. Gee ntị, onye ahụ m hụrụ nʼanya na-akụ aka nʼibo ọnụ ụzọ.* “Megheere m ụzọ, nwanne m nwanyị, onye m hụrụ nʼanya, nduru m, onye na-enweghị ntụpọ. Igirigi ezokwasịla m nʼisi, agịrị isi m jupụtara na mmiri nke abalị.” (3) Eyipụlarị m uwe m. Ọ bụ m yirikwa ha ọzọ? Asaala m ụkwụ m, aga m eme ka ha ruo unyi ọzọ?
Song of Songs 5:3 in English
Song of Songs 5:3 · Berean Standard Bible
(2) I sleep, but my heart is awake. A sound! My beloved is knocking: “Open to me, my sister, my darling, my dove, my flawless one. My head is drenched with dew, my hair with the dampness of the night.” (3) I have taken off my robe— must I put it back on? I have washed my feet— must I soil them again?
Context
1Abatala m nʼubi m a gbara ogige, nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ m.
Achịkọtala m máá ya na ụda m,
arachakwala m mmanụ aṅụ m na ugbugbo mmanụ aṅụ.
Aṅụkwala m mmiri ara ehi na mmanya m. 2(1) Rie, ṅụọkwa, unu ndị bụ enyi;
ṅụjuo afọ, unu ndị hụrụ onwe unu nʼanya. 3(2) A rahụrụ m ụra, ma obi m mụ anya.
Gee ntị, onye ahụ m hụrụ nʼanya na-akụ aka nʼibo ọnụ ụzọ.*
“Megheere m ụzọ, nwanne m nwanyị, onye m hụrụ nʼanya,
nduru m, onye na-enweghị ntụpọ.
Igirigi ezokwasịla m nʼisi,
agịrị isi m jupụtara na mmiri nke abalị.”
(3) Eyipụlarị m uwe m.
Ọ bụ m yirikwa ha ọzọ?
Asaala m ụkwụ m,
aga m eme ka ha ruo unyi ọzọ? 4Onye m hụrụ nʼanya gbatịrị aka ya imeghe ụzọ,
mgbe ahụ, obi m chọsikwara ya ike. 5Mụ onwe m biliri imeghere onye m hụrụ nʼanya ụzọ,
ma aka m abụọ jupụtakwara na mmanụ máá,
mmanụ máá si na mkpịsịaka m niile na-atapụsi,
nʼelu ihe mkpọchi nke ibo.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.