Native Bible

Song of Songs 5:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

(2) A rahụrụ m ụra, ma obi m mụ anya. Gee ntị, onye ahụ m hụrụ nʼanya na-akụ aka nʼibo ọnụ ụzọ.* “Megheere m ụzọ, nwanne m nwanyị, onye m hụrụ nʼanya, nduru m, onye na-enweghị ntụpọ. Igirigi ezokwasịla m nʼisi, agịrị isi m jupụtara na mmiri nke abalị.” (3) Eyipụlarị m uwe m. Ọ bụ m yirikwa ha ọzọ? Asaala m ụkwụ m, aga m eme ka ha ruo unyi ọzọ?

Song of Songs 5:3 in English

Song of Songs 5:3 · Berean Standard Bible

(2) I sleep, but my heart is awake. A sound! My beloved is knocking: “Open to me, my sister, my darling, my dove, my flawless one. My head is drenched with dew, my hair with the dampness of the night.” (3) I have taken off my robe— must I put it back on? I have washed my feet— must I soil them again?

Context

1Abatala m nʼubi m a gbara ogige, nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ m. Achịkọtala m máá ya na ụda m, arachakwala m mmanụ aṅụ m na ugbugbo mmanụ aṅụ. Aṅụkwala m mmiri ara ehi na mmanya m. 2(1) Rie, ṅụọkwa, unu ndị bụ enyi; ṅụjuo afọ, unu ndị hụrụ onwe unu nʼanya. 3(2) A rahụrụ m ụra, ma obi m mụ anya. Gee ntị, onye ahụ m hụrụ nʼanya na-akụ aka nʼibo ọnụ ụzọ.* “Megheere m ụzọ, nwanne m nwanyị, onye m hụrụ nʼanya, nduru m, onye na-enweghị ntụpọ. Igirigi ezokwasịla m nʼisi, agịrị isi m jupụtara na mmiri nke abalị.” (3) Eyipụlarị m uwe m. Ọ bụ m yirikwa ha ọzọ? Asaala m ụkwụ m, aga m eme ka ha ruo unyi ọzọ? 4Onye m hụrụ nʼanya gbatịrị aka ya imeghe ụzọ, mgbe ahụ, obi m chọsikwara ya ike. 5Mụ onwe m biliri imeghere onye m hụrụ nʼanya ụzọ, ma aka m abụọ jupụtakwara na mmanụ máá, mmanụ máá si na mkpịsịaka m niile na-atapụsi, nʼelu ihe mkpọchi nke ibo.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.