Native Bible

Song of Songs 5:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

(1) Rie, ṅụọkwa, unu ndị bụ enyi; ṅụjuo afọ, unu ndị hụrụ onwe unu nʼanya.

Song of Songs 5:2 in English

Song of Songs 5:2 · Berean Standard Bible

(1) Eat, O friends, and drink; drink freely, O beloved.

Context

1Abatala m nʼubi m a gbara ogige, nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ m. Achịkọtala m máá ya na ụda m, arachakwala m mmanụ aṅụ m na ugbugbo mmanụ aṅụ. Aṅụkwala m mmiri ara ehi na mmanya m. 2(1) Rie, ṅụọkwa, unu ndị bụ enyi; ṅụjuo afọ, unu ndị hụrụ onwe unu nʼanya. 3(2) A rahụrụ m ụra, ma obi m mụ anya. Gee ntị, onye ahụ m hụrụ nʼanya na-akụ aka nʼibo ọnụ ụzọ.* “Megheere m ụzọ, nwanne m nwanyị, onye m hụrụ nʼanya, nduru m, onye na-enweghị ntụpọ. Igirigi ezokwasịla m nʼisi, agịrị isi m jupụtara na mmiri nke abalị.” (3) Eyipụlarị m uwe m. Ọ bụ m yirikwa ha ọzọ? Asaala m ụkwụ m, aga m eme ka ha ruo unyi ọzọ? 4Onye m hụrụ nʼanya gbatịrị aka ya imeghe ụzọ, mgbe ahụ, obi m chọsikwara ya ike.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.