Abụ nke Abụ 5:1
Song of Songs 5:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Abatala m nʼubi m a gbara ogige, nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ m. Achịkọtala m máá ya na ụda m, arachakwala m mmanụ aṅụ m na ugbugbo mmanụ aṅụ. Aṅụkwala m mmiri ara ehi na mmanya m.
Song of Songs 5:1 in English
Song of Songs 5:1 · Berean Standard Bible
I have come to my garden, my sister, my bride; I have gathered my myrrh with my spice. I have eaten my honeycomb with my honey; I have drunk my wine with my milk.
Context
1Abatala m nʼubi m a gbara ogige, nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ m.
Achịkọtala m máá ya na ụda m,
arachakwala m mmanụ aṅụ m na ugbugbo mmanụ aṅụ.
Aṅụkwala m mmiri ara ehi na mmanya m. 2(1) Rie, ṅụọkwa, unu ndị bụ enyi;
ṅụjuo afọ, unu ndị hụrụ onwe unu nʼanya. 3(2) A rahụrụ m ụra, ma obi m mụ anya.
Gee ntị, onye ahụ m hụrụ nʼanya na-akụ aka nʼibo ọnụ ụzọ.*
“Megheere m ụzọ, nwanne m nwanyị, onye m hụrụ nʼanya,
nduru m, onye na-enweghị ntụpọ.
Igirigi ezokwasịla m nʼisi,
agịrị isi m jupụtara na mmiri nke abalị.”
(3) Eyipụlarị m uwe m.
Ọ bụ m yirikwa ha ọzọ?
Asaala m ụkwụ m,
aga m eme ka ha ruo unyi ọzọ?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.