Abụ nke Abụ 3:9
Song of Songs 3:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Eze Solomọn rụrụ onwe ya ụgbọ a nke o ji osisi sitere Lebanọn rụọ.
Song of Songs 3:9 in English
Song of Songs 3:9 · Berean Standard Bible
King Solomon has made his carriage out of the timber of Lebanon.
Context
7Lee ọ bụ ụgbọ Solomọn.
Iri mmadụ isii ndị ọka agha,
ndị a maara aha ha karịsịa nʼala Izrel sokwa ya. 8Ha niile ji mma agha;
ha bụ ndị a zụrụ nke ọma ibu agha.
Mma agha onye ọbụla dịkwa nʼukwu ya,
ịdị njikere maka ihe egwu abalị. 9Eze Solomọn rụrụ onwe ya ụgbọ a
nke o ji osisi sitere Lebanọn rụọ. 10Ogidi ya ka o ji ọlaọcha mee;
ala ya bụkwa ọlaedo.
Ebe ịnọdụ ọdụ ya ka e ji akwa odo odo kpaa,
e ji ịhụnanya dozie ebe ime ya.
Ndị inyom Jerusalem, 11pụtanụ,
bịa hụrụ, unu ụmụ agbọghọ Zayọn,
bịanụ ka unu hụ Solomọn bụ eze;
lee ụdị okpueze nne ya kpunyere ya nʼisi,
nʼụbọchị agbamakwụkwọ ya,
nʼụbọchị obi ụtọ na ịṅụrị ọṅụ ya.
3:3 Aịz 21:11-12
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.