Abụ nke Abụ 3:8
Song of Songs 3:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha niile ji mma agha; ha bụ ndị a zụrụ nke ọma ibu agha. Mma agha onye ọbụla dịkwa nʼukwu ya, ịdị njikere maka ihe egwu abalị.
Song of Songs 3:8 in English
Song of Songs 3:8 · Berean Standard Bible
All are skilled with the sword, experienced in warfare. Each has his sword at his side prepared for the terror of the night.
Context
6Onye bụ nke a na-esi nʼọzara na-abịa
dịka anwụrụ ọkụ,
nke tere mmanụ máá na ụda na-esi isi ụtọ,
ụda nke ndị ahịa na-ere? 7Lee ọ bụ ụgbọ Solomọn.
Iri mmadụ isii ndị ọka agha,
ndị a maara aha ha karịsịa nʼala Izrel sokwa ya. 8Ha niile ji mma agha;
ha bụ ndị a zụrụ nke ọma ibu agha.
Mma agha onye ọbụla dịkwa nʼukwu ya,
ịdị njikere maka ihe egwu abalị. 9Eze Solomọn rụrụ onwe ya ụgbọ a
nke o ji osisi sitere Lebanọn rụọ. 10Ogidi ya ka o ji ọlaọcha mee;
ala ya bụkwa ọlaedo.
Ebe ịnọdụ ọdụ ya ka e ji akwa odo odo kpaa,
e ji ịhụnanya dozie ebe ime ya.
Ndị inyom Jerusalem,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.