Abụ nke Abụ 3:6
Song of Songs 3:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye bụ nke a na-esi nʼọzara na-abịa dịka anwụrụ ọkụ, nke tere mmanụ máá na ụda na-esi isi ụtọ, ụda nke ndị ahịa na-ere?
Song of Songs 3:6 in English
Song of Songs 3:6 · Berean Standard Bible
Who is this coming up from the wilderness like a column of smoke, scented with myrrh and frankincense from all the spices of the merchant?
Context
4Ọ dịghị anya mgbe m gafere ha,
achọtara m onye m hụrụ nʼanya,
ejidesiri m ya ike, ahapụghị m ya aka
tutu m duta ya nʼụlọ nne m,
nʼime ụlọ nwanyị tụrụ ime m. 5Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem,
eji m nne mgbada niile na nne ele ọhịa gbaa unu iyi sị,
unu akpọtela, maọbụ mee ka ịhụnanya teta
ruo mgbe o masịrị ya. 6Onye bụ nke a na-esi nʼọzara na-abịa
dịka anwụrụ ọkụ,
nke tere mmanụ máá na ụda na-esi isi ụtọ,
ụda nke ndị ahịa na-ere? 7Lee ọ bụ ụgbọ Solomọn.
Iri mmadụ isii ndị ọka agha,
ndị a maara aha ha karịsịa nʼala Izrel sokwa ya. 8Ha niile ji mma agha;
ha bụ ndị a zụrụ nke ọma ibu agha.
Mma agha onye ọbụla dịkwa nʼukwu ya,
ịdị njikere maka ihe egwu abalị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.