Native Bible

Song of Songs 3:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye bụ nke a na-esi nʼọzara na-abịa dịka anwụrụ ọkụ, nke tere mmanụ máá na ụda na-esi isi ụtọ, ụda nke ndị ahịa na-ere?

Song of Songs 3:6 in English

Song of Songs 3:6 · Berean Standard Bible

Who is this coming up from the wilderness like a column of smoke, scented with myrrh and frankincense from all the spices of the merchant?

Context

4Ọ dịghị anya mgbe m gafere ha, achọtara m onye m hụrụ nʼanya, ejidesiri m ya ike, ahapụghị m ya aka tutu m duta ya nʼụlọ nne m, nʼime ụlọ nwanyị tụrụ ime m. 5Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, eji m nne mgbada niile na nne ele ọhịa gbaa unu iyi sị, unu akpọtela, maọbụ mee ka ịhụnanya teta ruo mgbe o masịrị ya. 6Onye bụ nke a na-esi nʼọzara na-abịa dịka anwụrụ ọkụ, nke tere mmanụ máá na ụda na-esi isi ụtọ, ụda nke ndị ahịa na-ere? 7Lee ọ bụ ụgbọ Solomọn. Iri mmadụ isii ndị ọka agha, ndị a maara aha ha karịsịa nʼala Izrel sokwa ya. 8Ha niile ji mma agha; ha bụ ndị a zụrụ nke ọma ibu agha. Mma agha onye ọbụla dịkwa nʼukwu ya, ịdị njikere maka ihe egwu abalị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.