Abụ nke Abụ 3:4
Song of Songs 3:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ dịghị anya mgbe m gafere ha, achọtara m onye m hụrụ nʼanya, ejidesiri m ya ike, ahapụghị m ya aka tutu m duta ya nʼụlọ nne m, nʼime ụlọ nwanyị tụrụ ime m.
Song of Songs 3:4 in English
Song of Songs 3:4 · Berean Standard Bible
I had just passed them when I found the one I love. I held him and would not let go until I had brought him to my mother’s house, to the chamber of the one who conceived me.
Context
2Ugbu a, aga m ebili pụọ jegharịa nʼama niile
na nʼokporoụzọ niile nke obodo ịchọ ya,
m ga-achọgharị onye m hụrụ nʼanya.
Ya mere, achọrọ m ya ma ahụghị m ya. 3Ndị nche na-eche obodo* hụrụ m,
mgbe ha na-agagharị nʼobodo,
ma ajụrụ m ha sị, “Biko, unu hụrụ onye ahụ m hụrụ nʼanya?” 4Ọ dịghị anya mgbe m gafere ha,
achọtara m onye m hụrụ nʼanya,
ejidesiri m ya ike, ahapụghị m ya aka
tutu m duta ya nʼụlọ nne m,
nʼime ụlọ nwanyị tụrụ ime m. 5Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem,
eji m nne mgbada niile na nne ele ọhịa gbaa unu iyi sị,
unu akpọtela, maọbụ mee ka ịhụnanya teta
ruo mgbe o masịrị ya. 6Onye bụ nke a na-esi nʼọzara na-abịa
dịka anwụrụ ọkụ,
nke tere mmanụ máá na ụda na-esi isi ụtọ,
ụda nke ndị ahịa na-ere?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.