Abụ nke Abụ 3:2
Song of Songs 3:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ugbu a, aga m ebili pụọ jegharịa nʼama niile na nʼokporoụzọ niile nke obodo ịchọ ya, m ga-achọgharị onye m hụrụ nʼanya. Ya mere, achọrọ m ya ma ahụghị m ya.
Song of Songs 3:2 in English
Song of Songs 3:2 · Berean Standard Bible
I will arise now and go about the city, through the streets and squares. I will seek the one I love. So I sought him but did not find him.
Context
1Achọrọ m onye m hụrụ nʼanya
nʼelu ihe ndina m nʼabalị, ma ahụghị m ya.
Ebiliri m chọọ ya ma ahụghị m ya. 2Ugbu a, aga m ebili pụọ jegharịa nʼama niile
na nʼokporoụzọ niile nke obodo ịchọ ya,
m ga-achọgharị onye m hụrụ nʼanya.
Ya mere, achọrọ m ya ma ahụghị m ya. 3Ndị nche na-eche obodo* hụrụ m,
mgbe ha na-agagharị nʼobodo,
ma ajụrụ m ha sị, “Biko, unu hụrụ onye ahụ m hụrụ nʼanya?” 4Ọ dịghị anya mgbe m gafere ha,
achọtara m onye m hụrụ nʼanya,
ejidesiri m ya ike, ahapụghị m ya aka
tutu m duta ya nʼụlọ nne m,
nʼime ụlọ nwanyị tụrụ ime m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.