Native Bible

Song of Songs 3:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, eji m nne mgbada niile na nne ele ọhịa gbaa unu iyi sị, unu akpọtela, maọbụ mee ka ịhụnanya teta ruo mgbe o masịrị ya.

Song of Songs 3:5 in English

Song of Songs 3:5 · Berean Standard Bible

O daughters of Jerusalem, I adjure you by the gazelles and does of the field: Do not arouse or awaken love until the time is right.

Context

3Ndị nche na-eche obodo* hụrụ m, mgbe ha na-agagharị nʼobodo, ma ajụrụ m ha sị, “Biko, unu hụrụ onye ahụ m hụrụ nʼanya?” 4Ọ dịghị anya mgbe m gafere ha, achọtara m onye m hụrụ nʼanya, ejidesiri m ya ike, ahapụghị m ya aka tutu m duta ya nʼụlọ nne m, nʼime ụlọ nwanyị tụrụ ime m. 5Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, eji m nne mgbada niile na nne ele ọhịa gbaa unu iyi sị, unu akpọtela, maọbụ mee ka ịhụnanya teta ruo mgbe o masịrị ya. 6Onye bụ nke a na-esi nʼọzara na-abịa dịka anwụrụ ọkụ, nke tere mmanụ máá na ụda na-esi isi ụtọ, ụda nke ndị ahịa na-ere? 7Lee ọ bụ ụgbọ Solomọn. Iri mmadụ isii ndị ọka agha, ndị a maara aha ha karịsịa nʼala Izrel sokwa ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.