Abụ nke Abụ 3:5
Song of Songs 3:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, eji m nne mgbada niile na nne ele ọhịa gbaa unu iyi sị, unu akpọtela, maọbụ mee ka ịhụnanya teta ruo mgbe o masịrị ya.
Song of Songs 3:5 in English
Song of Songs 3:5 · Berean Standard Bible
O daughters of Jerusalem, I adjure you by the gazelles and does of the field: Do not arouse or awaken love until the time is right.
Context
3Ndị nche na-eche obodo* hụrụ m,
mgbe ha na-agagharị nʼobodo,
ma ajụrụ m ha sị, “Biko, unu hụrụ onye ahụ m hụrụ nʼanya?” 4Ọ dịghị anya mgbe m gafere ha,
achọtara m onye m hụrụ nʼanya,
ejidesiri m ya ike, ahapụghị m ya aka
tutu m duta ya nʼụlọ nne m,
nʼime ụlọ nwanyị tụrụ ime m. 5Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem,
eji m nne mgbada niile na nne ele ọhịa gbaa unu iyi sị,
unu akpọtela, maọbụ mee ka ịhụnanya teta
ruo mgbe o masịrị ya. 6Onye bụ nke a na-esi nʼọzara na-abịa
dịka anwụrụ ọkụ,
nke tere mmanụ máá na ụda na-esi isi ụtọ,
ụda nke ndị ahịa na-ere? 7Lee ọ bụ ụgbọ Solomọn.
Iri mmadụ isii ndị ọka agha,
ndị a maara aha ha karịsịa nʼala Izrel sokwa ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.