Abụ nke Abụ 3:7
Song of Songs 3:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Lee ọ bụ ụgbọ Solomọn. Iri mmadụ isii ndị ọka agha, ndị a maara aha ha karịsịa nʼala Izrel sokwa ya.
Song of Songs 3:7 in English
Song of Songs 3:7 · Berean Standard Bible
Behold, it is Solomon’s carriage,* escorted by sixty of the mightiest men of Israel.
Context
5Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem,
eji m nne mgbada niile na nne ele ọhịa gbaa unu iyi sị,
unu akpọtela, maọbụ mee ka ịhụnanya teta
ruo mgbe o masịrị ya. 6Onye bụ nke a na-esi nʼọzara na-abịa
dịka anwụrụ ọkụ,
nke tere mmanụ máá na ụda na-esi isi ụtọ,
ụda nke ndị ahịa na-ere? 7Lee ọ bụ ụgbọ Solomọn.
Iri mmadụ isii ndị ọka agha,
ndị a maara aha ha karịsịa nʼala Izrel sokwa ya. 8Ha niile ji mma agha;
ha bụ ndị a zụrụ nke ọma ibu agha.
Mma agha onye ọbụla dịkwa nʼukwu ya,
ịdị njikere maka ihe egwu abalị. 9Eze Solomọn rụrụ onwe ya ụgbọ a
nke o ji osisi sitere Lebanọn rụọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.