Native Bible

Song of Songs 1:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

(4) Lee nʼizi ezi ka ha nʼahụ gị nʼanya nke ukwuu. (5) Ana m eji nji ma a maara m mma ile anya, unu ụmụ agbọghọ Jerusalem. Adị m nji dịka ụlọ ikwu nke Keda* dịka akwa mgbochi dị nʼụlọ Solomọn. (6) Unu elekwasịla m anya, maka na m na-eji nji. Ọ bụ anwụ gbajiri m. Ụmụnne m ndị ikom were iwe megide m, zipụ m nʼezi ilekọta ubi vaịnị anyị, ma ubi vaịnị nke m ka m na-elekọtaghị.

Song of Songs 1:6 in English

Song of Songs 1:6 · Berean Standard Bible

(4) It is only right that they adore you. (5) I am dark, yet lovely, O daughters of Jerusalem, like the tents of Kedar, like the curtains of Solomon. (6) Do not stare because I am dark, for the sun has gazed upon me. My mother’s sons were angry with me; they made me a keeper of the vineyards, but my own vineyard I have neglected.

Context

4Kpọrọ m, ka mụ na gị soro, ka anyị mee ngwangwa. Ka eze kpọbata m nʼime ụlọ ya. 5(4) Anyị ga-aṅụrị ọṅụ nwekwa obi ụtọ nʼime gị. Anyị ga-eto ịhụnanya gị karịa mmanya. 6(4) Lee nʼizi ezi ka ha nʼahụ gị nʼanya nke ukwuu. (5) Ana m eji nji ma a maara m mma ile anya, unu ụmụ agbọghọ Jerusalem. Adị m nji dịka ụlọ ikwu nke Keda* dịka akwa mgbochi dị nʼụlọ Solomọn. (6) Unu elekwasịla m anya, maka na m na-eji nji. Ọ bụ anwụ gbajiri m. Ụmụnne m ndị ikom were iwe megide m, zipụ m nʼezi ilekọta ubi vaịnị anyị, ma ubi vaịnị nke m ka m na-elekọtaghị. 7Gwa m, gị onye m hụrụ nʼanya, ebee ka anụ ụlọ gị na-ata nri? Ebee ka atụrụ gị na-ezu ike nʼetiti ehihie? Nʼihi gị ka m ga-eji dịka nwanyị e kpuchiri ihu nʼetiti igwe anụ ụlọ ndị enyi gị. 8Ọ bụrụ na ị maghị, gị nwanyị kachasị mma, soro nzọ ụkwụ igwe atụrụ meekwa ka ụmụ ewu gị taa ahịhịa dị nʼakụkụ ụlọ ikwu ndị na-elekọta atụrụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.