Abụ nke Abụ 1:4
Song of Songs 1:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Kpọrọ m, ka mụ na gị soro, ka anyị mee ngwangwa. Ka eze kpọbata m nʼime ụlọ ya.
Song of Songs 1:4 in English
Song of Songs 1:4 · Berean Standard Bible
Take me away with you—let us hurry! May the king bring me to his chambers.
Context
2Ya were nsusu niile nke ọnụ ya susuo m ọnụ,
nʼihi na ịhụnanya gị dị ụtọ karịa mmanya. 3Mmanụ otite gị niile na-esi isi ọma,
aha gị dịka mmanụ isi ụtọ awụpụtara awụpụta,
ọ bụghị ihe ịtụnanya na ụmụ agbọghọ hụrụ gị nʼanya. 4Kpọrọ m, ka mụ na gị soro, ka anyị mee ngwangwa.
Ka eze kpọbata m nʼime ụlọ ya. 5(4) Anyị ga-aṅụrị ọṅụ nwekwa obi ụtọ nʼime gị.
Anyị ga-eto ịhụnanya gị karịa mmanya. 6(4) Lee nʼizi ezi ka ha nʼahụ gị nʼanya nke ukwuu.
(5) Ana m eji nji ma a maara m mma ile anya,
unu ụmụ agbọghọ Jerusalem.
Adị m nji dịka ụlọ ikwu nke Keda*
dịka akwa mgbochi dị nʼụlọ Solomọn.
(6) Unu elekwasịla m anya, maka na m na-eji nji.
Ọ bụ anwụ gbajiri m.
Ụmụnne m ndị ikom were iwe megide m,
zipụ m nʼezi ilekọta ubi vaịnị anyị,
ma ubi vaịnị nke m ka m na-elekọtaghị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.