Abụ nke Abụ 1:7
Song of Songs 1:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gwa m, gị onye m hụrụ nʼanya, ebee ka anụ ụlọ gị na-ata nri? Ebee ka atụrụ gị na-ezu ike nʼetiti ehihie? Nʼihi gị ka m ga-eji dịka nwanyị e kpuchiri ihu nʼetiti igwe anụ ụlọ ndị enyi gị.
Song of Songs 1:7 in English
Song of Songs 1:7 · Berean Standard Bible
Tell me, O one I love, where do you pasture your sheep? Where do you rest them at midday? Why should I be like a veiled woman beside the flocks of your companions?
Context
5(4) Anyị ga-aṅụrị ọṅụ nwekwa obi ụtọ nʼime gị.
Anyị ga-eto ịhụnanya gị karịa mmanya. 6(4) Lee nʼizi ezi ka ha nʼahụ gị nʼanya nke ukwuu.
(5) Ana m eji nji ma a maara m mma ile anya,
unu ụmụ agbọghọ Jerusalem.
Adị m nji dịka ụlọ ikwu nke Keda*
dịka akwa mgbochi dị nʼụlọ Solomọn.
(6) Unu elekwasịla m anya, maka na m na-eji nji.
Ọ bụ anwụ gbajiri m.
Ụmụnne m ndị ikom were iwe megide m,
zipụ m nʼezi ilekọta ubi vaịnị anyị,
ma ubi vaịnị nke m ka m na-elekọtaghị. 7Gwa m, gị onye m hụrụ nʼanya,
ebee ka anụ ụlọ gị na-ata nri?
Ebee ka atụrụ gị na-ezu ike nʼetiti ehihie?
Nʼihi gị ka m ga-eji dịka nwanyị e kpuchiri ihu
nʼetiti igwe anụ ụlọ ndị enyi gị. 8Ọ bụrụ na ị maghị, gị nwanyị kachasị mma,
soro nzọ ụkwụ igwe atụrụ
meekwa ka ụmụ ewu gị taa ahịhịa
dị nʼakụkụ ụlọ ikwu ndị na-elekọta atụrụ. 9Ana m atụnyere gị, gị onye m hụrụ nʼanya dịka nne ịnyịnya
e kenyere nʼotu ụgbọ agha Fero.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.