Native Bible

Song of Songs 1:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụrụ na ị maghị, gị nwanyị kachasị mma, soro nzọ ụkwụ igwe atụrụ meekwa ka ụmụ ewu gị taa ahịhịa dị nʼakụkụ ụlọ ikwu ndị na-elekọta atụrụ.

Song of Songs 1:8 in English

Song of Songs 1:8 · Berean Standard Bible

If you do not know, O fairest of women, follow the tracks of the flock, and graze your young goats near the tents of the shepherds.

Context

6(4) Lee nʼizi ezi ka ha nʼahụ gị nʼanya nke ukwuu. (5) Ana m eji nji ma a maara m mma ile anya, unu ụmụ agbọghọ Jerusalem. Adị m nji dịka ụlọ ikwu nke Keda* dịka akwa mgbochi dị nʼụlọ Solomọn. (6) Unu elekwasịla m anya, maka na m na-eji nji. Ọ bụ anwụ gbajiri m. Ụmụnne m ndị ikom were iwe megide m, zipụ m nʼezi ilekọta ubi vaịnị anyị, ma ubi vaịnị nke m ka m na-elekọtaghị. 7Gwa m, gị onye m hụrụ nʼanya, ebee ka anụ ụlọ gị na-ata nri? Ebee ka atụrụ gị na-ezu ike nʼetiti ehihie? Nʼihi gị ka m ga-eji dịka nwanyị e kpuchiri ihu nʼetiti igwe anụ ụlọ ndị enyi gị. 8Ọ bụrụ na ị maghị, gị nwanyị kachasị mma, soro nzọ ụkwụ igwe atụrụ meekwa ka ụmụ ewu gị taa ahịhịa dị nʼakụkụ ụlọ ikwu ndị na-elekọta atụrụ. 9Ana m atụnyere gị, gị onye m hụrụ nʼanya dịka nne ịnyịnya e kenyere nʼotu ụgbọ agha Fero. 10Agba nti gị ka e jiri ọlantị chọọ mma, olu gị kwa ka e jiri nkume dị oke ọnụahịa e doro nʼahịrị chọọ mma.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.